Akụkọ Ụwa

Onyeisi Ọhanaeze Agaala Mgbaru nʻImo

Hope Uzodimma

Ụbọchị Mọnday ọnwa Julayị dị na mkpụrụ ụbọchị asaa ka onyeisi Ọhanaeze Ndịigbo bụ Maazị Nnia Nwodo mere mjem mgbaru na Steeti Imo. Ọ gara ebe ahụ ịhụ gọvanọ na-achị Imo bụ Maazị Hope Ụzọdimma gbasara ogbughu ndị Fulani na-achị ehi gburu nwaamaala Steeti Imo nʻOguta nʻizu gara aga. Maazị Nwodo jikwe oge ahụ mee nchọpụta gbasra ihe gomenti Imo na-eme gbasara ndị omemaome a kpọrọ ndị Fulani.

Nʻokwu ya mgbe ya na Gọvanọ Ụzọdịmma zutere, Maazị Nwodo gwakwara ya bụ gọvanọ ka o were ọnọdụ ya rịọ gọvament etiti ka ha kwụsị mmegbu a na-emegbu ndịigbo na Naịjirịa. Gọvanọ Ụzọdịmma gwakwara Maazị Nwodo ka o nyere aka hụ na mmekọrịta ndịigbo na ndị na-achị Naịjirịa dị mma.

Leave a Reply