Gọvanọ Obiano Ekwela Nkwa Nde Naịra Ise Maka Onye Gbara Ama Gbasara Ọnwụ Maazị Igboka
Aka na achị Steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano, ekwela nkwa na a ga-enye onye ọbụla gbara ama gbasara ọnwụ Onyeisioche ndi Nimo, bụ Maazị Frank Igboka, nde naira ise dịka ihe nrite. Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasa ozi nʻAnambara bụ Maazị Don Adinuba kwupụtara nke a mgbe ndị nta akụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ. Ọ sịrị na ọnwu Maazị Igboka wutere Gọvanọ Obiano nke ukwu nke mere o jiri […]