Akụkọ Ụwa

Fụransị Eburule Iko Bọọlụ Mba Ụwa nke Afọ 2018

Pogba

Moscow – Obodo Fụransị eturule ugo n’egwuregwu bọọlụ mba ụwa nke Bekee kpọrọ World Cup nke bịara na ngwụcha ụbchị ụka. Fụransị jiri goolu anọ nke a sara naanị abụọ merie mba Kroeshia nʻasọmmpi egwuregwu bọọlụ ọkaibe ahụ nke e mere na Rọshịa. Nke a bụ nke ugboro abụọ mba Fransị na-ebute iko a.

Pogba na ndị Furansị na-an̄ụrị ọn̄ụ na mmeri ha

Tupu egwuregwu amalite, ọtụtụ ndị ọnọ nʻala mara egbe dị ime na-ekwu na Kroeshia, bụ ndị nke meriri Naijiria nʻegwuregwu ahụ mgbe gara aga, ga-anyụ Fụransị ịkpakwu. Mana mgbe oge ruru, ihe adịghị ke e siri chee ya. Ndị Fụransị gosiri nke ha jiri bụrụ ọkaibe.

Mmeri Fụransị meriri nʻegwuregwu bọọlụ a gosiri ọtụtụ mmadụ na ndị ojii maara nke ekwe na-akụ nʻegwuregwu bọọlụ. Ihe karịrị mmadụ asaa ndị soro gbaara Fransị ya bụ bọọlụ bụ ndị ojii. Ọtụtụ nʻime ha bụ ndị ojii si mba Afrika. Ụfọdụ nʻime ha bụ mmadụ dịka Pogba, Mbappe, Umtiti, Kante na Nzonzi nakwa ndị ọzọ.

Mbappe onye nyere otu goolu

Ọ bụ eziokwu na mba Afrịka anọ ndị ọzị bu Naijiria, Ijiputi, Moroko, Senegalu na Tunishia jere ya bụ asọmpi mana ha achịtaghị aja. Mana kama ehi m ga-agbanahụ m, ka m gbubiri ya ọdụ. Ndị Afrịka ga-eji mmeri Fụransị meriri na-edi. Ụbọchị nta ọzọ, ndị Afụrika esoro chụọ nʻowere nchi.

Ụmụ Afụrịka

Leave a Reply