Akụkọ Ụwa

Naịjirịa Ezila Aịslandị Ihe Ndị Ọkụ Ji Ntị Oke Eme

ahmed musa2
Ahmed Musa

Ndị otu egwu bọọlụ Naịjiria a na-akpo Super Eagles anyụọola ndị ogbo ha si Aịslandị ịkpakwụ nʻegwuregwu bọolụ. Naịjirịa jiri ọkpụ abụọ ana-asaghị asa merie ndị mba Aisilandi nʻegwuregwu bọọlụ mba ụwa nke a na-agba na Rọshịa.

Mgbe egwuregwu a malitere, ndị Aisilandi  bidoro mewe ụn̄ara ka a ga-asị na o nwere ebe ha ji azụ eje. Nke a mere ka agba nke mbụ bie nʻonye lawa onye lawa. Mana mgbe e siri nʻezumike lọghachi nʻagba nke abụọ, ndị Naịjiria sịrị na oge eruole mgbe ha ga-ajụ ndị Aisilandi  onye nyere ha bụ nwata anụ ha ji esubi mmanụ.

Naịjiria nyere goolu nke mbụ na nkeji iri anọ na itoolu mgbe Ahmed Musa jiri ụkwụ butuo bọọlu nke Moses gbanyeere ya ma gbabanyezie ya na goolu ndị Aisilandị. Ka nke a mechere, ndi Super Eagles na-agbakwa bọọlụ na ndị bịara ije ituru ugo.

Ebe a na-eti na oke tara ọka nwata, ọ shachanye ya ajịrịja nʻanya, otu nwaamadị ahụ bụ Musa, onye na-agba ọsọ ka mvụlu, gbanahụrụ ndị Aisilandị ma gbabanyekwe goolu nke abụọ na nkeji nke iri asa na anọ. Mgbe ahụ ka ndị Aisilandị jiri mara ihe ọkụ ji ntị oke eme.

Ahmed Musa mgbe o nyere goolu

Ka a ga-asị na Aịsịlandị bụ omewere ma chi ekweghị, e nyere ha ohere iji ntaramahụhụ nye goolu mana ha gbafuru ya. Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ wee kwuo na taa abụghụ ụbọchị ndị Aịsịlandị maọbụ na aka Chukwu dị na mmeri ndị Najiria meriri.

Naịjirịa na Ajentina, ndị nke na-agba ọnyụpa ugbu a, ga-ezute ụbọchị Tuuzdee na-abịa abịa.

Leave a Reply