Akụkọ Ụwa

Eze Williams Ezugwu Jere Hụ Ndịigbo na New England

eze william2
HRM Eze William Ezugwu (Eze Ogbozara III nʻOpi)
HRM Eze William Ezugwu (Eze Ogbozara III nʻOpi)

Ụbọchị Ụka Ọnwa Juunu dị na mkpụrụ ụbọchị atọ ka eze a maara amara n’ala Igbo niile bụ Eze Williams Ezugwu (Eze Ogbozara III nke Opi), bịara na Boston ịhụ ndị Igbo bi bee ahụ. Eze Ezugwu onye na-achị obodo Opi nke dị n’akụkụ Nsụka, wụchara na Boston, ya na onye ndu ya bụ Sir Ambrose Ojimba (Ojinnaka nʻUli).

Mgbe Eze Ezugwu a rụrụ Boston, ọ bụrụ ụzọ gaa n’Obigbo nke dị na nọmba 1 North Street na Randolph. Eze ndịigbo na Boston bụ Ọkaa Ejike Eze (Omenka nke mbụ n’Udi) nabatara ya n’ọgbakọ ndịigbo ma chekweere ya ọjị dịka omenala Igbo sịrị dị. Eze Ezugwu kelere Eze Ndịigbo na Boston ma were ohere ahụ gọọrọ ndịigbo ọfọ. Ọ gọrọ ọfọ ndụ, ọfọ ahụike, ihe akụ akụ, ihe enwe enwe, ọganihu ma ịhụnanya. Ọ gọzikwara ndịigbo niile bịara nzukọ ma rịọ Chineke ka o chebe ha.

Eze Ezugwu onye nke ndọrọndọrọ ọchịchị doro anya, onye nke bụkwa odeakwụkwọ ukwu nke otu jikọtara ndị ndọrọndọro a na-akpọ  Conference of Nigerian Political Parties (CNPP),  jiri ohere ahụ wee gwa ndịiigbo na New England maka mbọ niile a na-agba nʻala Igbo ka ihe dịrị mma. O bere akwa arịrị maka mmegbu a na-emegbu ndịigbo na Naijiria ma kelekwee ndị Igbo bi nʻofesi maka ego niile ha na-ezilata Alaigbo nke mere ka ndị Igbo hụ tụrụ rachaa. Ọ rịorọ ka ha ghara ịda mba na mbọ ha inyere aka nʻAla Igbo.

 

Eze William Ezugwu na Omenka Ejike Eze, Eze Ndịigbo na New England na ndị ọchịchị ndịigbo
Eze William Ezugwu na Omenka Ejike Eze, Eze Ndịigbo na New England na ndị ọchịchị ndịigbo

N’okwu nke ya, Omenka Ejike Eze kelere Eze ka Eze etu ọ siri bịa kpọkuru ya na Ndịigbo, wee gokwaara ya ọfọ ije ọma ka ụkwụ ghara ịkpọ ya na njem ọ bịara. Ọ jikwara ohere ahụ wee rịọ Eze ka Eze ka ọ laghachi azụ n’ọnwa Ọgọọsịtị dị na mkpụrụ ụbọchị iri na otu iji nọnyere ndịigbo mgbe ha ga-eme mmemme Ụbọchị Ndịigbo. Eze ka Eze kwere nkwa na ya ga-agbalị mee etu a.

Leave a Reply