
Otu jikọtara ndịigbo niile bi n’ofesi bụ World Igbo Congress (WIC) amalitela kwadowe maka mmemme ọgbakọ ukwu nke a ga-eme na mba Tennessee nke dị n’Amerịka malite n’ọnwa Ọgọọstị 30 ruo Septemba 2 n’afọ 2018.
N’okwu mgbasa ozi ya, Onyeisioche WIC bụ Maazị Anthony Ejiofo kọwara na ọgbakọ a ga-enye ndiigbo ohere itiko isi ọnụ mara etu e si akwo onye ukwu wara.