Akụkọ Ụwa

Kroeshịa Emerila Naijirịa n’Asọmmpi Egwuregwu Bọọlụ Mbaụwa

super eagles
Super Eagles

Mmiri erughi eru mara Naijiria ụbọchị Satọdee mgbe ndị egwu bọọlụ mba Kroeshia jiri ọkpụ goolu abụọ a na-asaghị asa nyụọ ndị egwu bọọlụ Naijiria ịkpakwụ n’asọmmpi egwu bọọlụ mbaụwa nke a na-agba ugbu a na Rọshịa.

Na mbido ya bụ egwuregwu, ndị Naijiria malitere nke ọma ma gbaa ndị na-ekiri ya bụ asọmmpi ume na ha maara nke ekwe na-akụ. Mana ebe e jighị ụtụtụ ama njọ ahịa, ọ dịghị anya tupu ndị mba Kroeshia egosi Naijiria na ha bụ ochie dike. Ha fụnyere ndị egwuregwu Naijiria ọkụ n’ike nke mere ka otu onye Naijiria jiri aka ya sọbanye bọọlụ n’ọnụ goolu nke ya.

Ebe a ka na-ekwu na oke tara ọka nwata, ọ shachanye ya ajịrịja n’anya. Otu onye Naijiria jiri aka ya kotere Naịjiria ntaramahụhụ nke ndị Bekee na-akpọ penariti. Nke a mere ka Kroeshịa nye goolu nke abụọ. Naijiria agbaghị aka ahịa na ya bụ egwuregwu.

Ọtụtụ ndị egwuregwu bọọlụ doro anya tinyere mmadụ dị ka Okey Chika, ochie dike gbabuuru ndị egwu bọọlụ Rangers International dị n’Enugwu, kọwara na ndị Naịjirịa emeghị ka ndị chọrọ ituru ugo n’egwuregwu ahụ. Ọ sịrị na Naijiria ga-agba mbọ merie n’asọmmpi ndị fọdụrụ ka ọ ghara ịdị ka ha dutere mba ụwa ndị ọzọ ozi n’egwuregwu afọ a.

Leave a Reply