Akụkọ Ụwa

Afọ Iri Ise na Otu Gara Aga

Ojukwu
Dim Emeka Odumegwu Ojukwu

Taa ka o mere afọ iri ise na otu e hiwere Ala Biafra. Ihe butere nhiwe Biafra bụ nke doro ewu na ọkụkọ anya. Ndị Ugwu na-egbu ụmụigbo ka a ga-asị na ọ bụghị nne mụrụ ha. Ebe ọ bụ naanị osisi ka a ga-agwa na a ga-egbu ya ọ kwụrụ ebe ọ kwụ, ụmụigbo gwara onyendu ha bụ Dim Emeka Odumegwu Ojukwu, dike na dịmkpa, otu onye a na-asị nnọọ nụ, ka o hiwere ha Ala Biafra. Igbo sịrị na a gbaghịrị ya bụ ụzọ owere mgba, ọ naghị echi. Etu a ka ọkụkọ siri gbasaa okpesi.

Ka anyị na-eme mmemme ichetea ndị niile tufuru ndụ ha nʻọgụ Biafra, anyị na-echetere ụmụigbo na ihe ahụ bere mgbe mbụ ka na-ebekwe. Ọkụkọ siri nʻala felie fegoro mkpumkpu, nʻala ka ọ ka nọkwa. Ụmụigbo, biko chete nụ na onye ndịiro gbara gburugburu na-eche ndụ ya nche mgbe niile.

Igbo ga-adị gbaa mgbọrọgwụ.

 

Ọkọrọtọ Biafra

Leave a Reply