Akwụkwọ Igbo

Omenụkọ

Nʻafọ 1931 ka Maazị Pịta Nwana dere akwụkwọ Igbo mbụ nke ọ kpọrọ Omenụko. Ọ bụghị naanị na Omenụkọ bụ iduuazị izizi e dere nʻasụsụ Igbo, ọ bụkwa iduuazị nke ka na-ewu ewu ruo taa.

Isiokwu Omenụkọ bụ ngosipụta na mmdụ jee mba, ọtụmasịghị etu ihe siri gaziere ya, ọtụmasịghị etu o siri baa ọgaranya, ọtụtụ ihe ga na-echetere ya na ya bụ ọbịa nʻebe ahụ. Mgbe nke a megidere, onye ahụ ga-akwara ngwongwo ya laghachi ala a mụrụ ya. Naanị mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ezumike.

Mgbe Omenụkọ mere arụ site nʻirefu ụmụaka na-azụrụ ya ahịa, tinyere otu nwanna ya, ya na ụmụnne ya gbalara ala Mgbọrọgwụ ebe ọ nọrọ baa nnukwu ọgaranya. Mana mgbe oge ruru, ọtụtụ ihe cheteere Omenụkọ na ọ bụ ọbịa nʻala Mgbọrọgwọ, nke mere ka ọ lọghachi ala nna ya.

Omenụkọ bụ akwụkwụ kwesiri ka onye Igbo ọbụla gụọ.

Leave a Reply