Ndị APGA Ebole Gọvanọ Obianọ Ebubo

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Otu kpọrọ onwe ha APGA Peopleʻs Alliance ebole gọvanọ na-achị Steeti Anambara bụ Maazị Willie Obianọ ebubo na ọ chọrọ ime ha “i were nke a i rie m ego” nʻihe gbasara ịhọpụta onyeisioche otu ndọrọndọrọ APGA. Ndị otu a were maara ya bụ gọvanọ ọkwa ka ọ gharakwa ịkpa nwa agụ aka nʻọdụ maka na ọ nwaa nke a anwaa, ya ezị ya ihe ọkụ na-eme ntị oke. Nʻozi […]

Saraki Etoole Ụmụnwaanyị Egwu Bọọlụ Super Falcons

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Ụbọchị Satọdee gara aga ka ụmụnwaanyị egwuregwu bọọlụ Naịjirịa a kpọrọ Super Falcons jiri ọkpụ isii a sara ise were merie ndị ogbo ha ndị Cote d’Ivoire were buru iko West African Footbool Union (WAFU). Onyeisi ụlọ ukwu na-emebe iwu na Naịjirịa toro ụmụagbọghọ a maka ike ha kpara nʻasọmmpi egwuregwu ahụ. Nʻozi o sị nʻọnụ onye ndụmọdụ ya na-ahụ maka mgbasaozi bụ Maazị Yusuph Olaniyonu were zisaa, Maazị Saraki […]

Ndị Uweojii Nọ nʻAba Aghọọla Nkịta Tara Ọkpụkpụ A Nyawara Ha nʻOlu

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

          Ndị bi nʻala Enyimba bụ Aba, etiele mkpu tikuo ụwa niile na-akọwa na ndị uweojii nọ na mba ahụ na ndị omekome bụzị ara na obi. Ha sịrị na ebe ọ kache ewute ha bụ na ndị ohi, ndị soja na ndị Uweojii dịzị ka ha na-egbunye nʻotu akpa. Ụfọdụ nʻime ha sịrị na ọ bụ egbe ndị uweojii ka ndị abalịdịegwu a ji eje […]

Ọdụ Ụgbọelu Dị nʻEnugwu Nwere Ike Imechi

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Onyeisi na-ahụ maka mjem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Maazị Hadi Siraka ekwuole na ọdụ ụgbọelu dị nʻEnugwu, nke a na-akpọ Akanu Ibiam International Airport, nwere ike imechi na nso nso. O kwuru na ihe ga-ebute mmechi a bụ na ọdụ ụgbọelu ahụ adịghị etu o kwesiri ịdị. Nʻezie, ọtụtụ ndị merele mjem site nʻọdụ ụgbọelu ahụ kwuru na o riri mperi nʻebe dị iche iche. Ụfọdụ sịrị na ọdụ ụgbọala […]

Gọvanọ David Umahi Nke Ebọnyị Abụọla Ndị Otu Nzuzo Ọnụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Igbo sịrị oke amana ụma taa akpa dibịa, ma dibịa amana ụma bụọ oke ọnụ. Mana Gọvanọ David Umahi na-achị Steeti Ebọnyị abụọla ndị otu nzuko dị iche iche na steeti ya ọnụ. Gọvanọ Umahị gwara ndị ụlọ na-emebe iwu na steeti ahụ na onye otu nzuzo ọbụla ewepughị aka enwe nʻofe tupu abalị asaa ga-ahụ ihe ndị mmụọ ji ntị oke eme. Gọvano Umahi kwuru nke a mgbe ọ […]

Maazị Nwankwọ Kanu Amalitere Ebe Ọzụzụ Ndị Egwu Bọọlụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

 Ihe ọ sọrọ sị mee enwe, anya ga-atọrịrị ya nʻelu osisi. Ọ bụ eziokwu na Maazị Nwankwo Kanu kụchara egwuregwu bọọlụ laa ezumike, uche ya ka nọkwa nʻegwuregwu bọọlụ. Ọ bụ ya mere Maazị Kanu jiri malite ebe a na-azụpụta ndị chọrọ iji egwuregwu bọọlụ aracha aka. Ụlọ egwuregwu ahụ nke a kpọrọ Kanu International Football Academy (KIFA) nwere ngalaba iri abụọ na Naịjirịa mana isiụlọọrụ ha dị na Legọọsị. […]

Maazị Christian Chukwu Awụchiele na Lọndọnụ Ịgwọ Onwe Ya

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Otu onye ụkwụ ya na-aghọ nkọ ka agụwa nʻegwregwu bọolụ, onye nke bụkwa onyendu ndị egwuregwu bọọlụ Green Eagles nke Naịjirịa mgbe elu bụ ala ọsa, bụ Maazị Christian Chukwu, awụchiele na Lọndọnụ ka a gwọọ ya ọrịa jidere ya. Maazị Christian Chukwu, nke e jiri Chairman were mara, na nwunye ya bụ Lilian Nkeiruka, rutere Lọndọnụ ka ndị dibịa Bekee ihe mere ya bụ agadi nwaanyị ka ọ dị […]

Mahadum Nnamdị Azikiwe Enweele Onyeisi Ọhụrụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

  Mahadum Nnamdị Azikiwe dị nʻỌka enweele onyeisi ọhụrụ nke aha ya bụ Ọkankuzi Charles Esimone. Ọkankuzi Esimone meriri mmadụ iri atọ na asaa ndị ọzọ chọrọ ọrụ ahụ were bụrụ ọkaibe. Ọ ga-anọ nʻọkwa ahụ afọ ise. Onyeisi mgbasaozi Mahadum ahụ bụ Ọkaa Emmanuel Ojukwu siri na ọ bụ eziokwu na mmadụ iri atọ na asatọ zọrọ ọkwa ahụ, naanị mmadụ asaa bụ ndị maara ihe ekwe na-akụ. Ọchịchị […]

Arụ Emeela n’Agụleri

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Ndị ichie nʻAgụleri agwala mmadụ anọ si nʻobi Eze Idigo ka ha were ihe karịrị otu nde naira na ọkara were kpụọ arụ nʻihi nsọala nke ha mere na mba ahụ. Nke a na-eme mgbe a họpụtachara eze ọhụrụ na mba ahụ. Mmiri malitere gbarụwa nʻAgụleri mgbe eze na-achị obodo ahụ, bụ Eze Christopher Nwabụnwanne Idigo, nwụrụ ka ọ chịchara mba ahụ ihe karịrị iri afọ abụọ na anọ. Ka […]

Awụsa Na-Achị Ehi Awakpola Obodo Gọv Okowa na Steeti Delta

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Nwata nna ya zuru ohi na-eji ụkwụ agbawa ụzọ. Ndị Awụsa emekwele ka ha si eme. Na nke ugbu a, ha wakporo obodo Owa-Alero dị nʻokpuru ọchịchị Ịka na Steeti Delta. Owa-Alero bụ obodo gọvanọ na-achi Steeti Delta bụ Maazị Ifeanyị Okowa. Ndị osochiegbu a jiri mma bọọ, ka a na-abọ anụ ọhịa, otu nwaanyi na-achụ nta ihe ọ ga-eri nʻugbo ya. Nwaanyị a bụ Odoziakụ Jomo Nwahmdi dịzị ka […]