Gọọmenti Anambra Agbapeela Akụrụngwa Ọhụrụ n’Ụlọọgwụ Enugwu-Ukwu
N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee gbapee ọmarịcha akụrụngwa ahụike ọhụụ (bụ ‘Ultrasound Machine’) na akụrụngwa e ji esi n’ike anyanwụ adọta ọkụ (bụ ‘Solar Energy System’) e butèrè n’ụlọ ahụike ọhaneze dị n’Enugwu-Ukwu, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka.Akụrụngwa ọhụụ niile ahụ bụ nke a gbapèrè site n’aka osote Gọvanọ steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke. N’okwu ya oge ọ na-agbape akụrụngwa ahụ, Dọkịta Okeke mèrè […]