Ndịntorobịa Ọhaneze Adọọla Ndị Awụsa Na-Achị Ehi Aka na Ntị

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Ndịntorobịa Ọhanaeze Ndigbo ekwuole na agwọ nʻakịrịka gbasara ihe ndị omekome na-achị ehi na-eme nʻala Igbo. Ndị a sịrị na ha bụ ndị na-achị ehi eforole ntutu taa, were na-achọ ka ha kpochapụ ụmụigbo na be nke ha. Ndịntorobịa kpọkụru ndị na-achị achị, na steeti ise mebere alaigbo tinyere ndị ogbo ha na steeti Delta na mba mmiri ka ha nyere aka kechie ma chekwebe ala igbo ka ndị osochiegbu […]

Enugwu Ga-Enwe Mahadum Ọzụzụ Ndịnkuzi

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Ihu bụ ọhanaeze ọchị ọchị ka nwata tụtụtara tọrọ, ụbọchị Tuuzdee gara aga, mgbe Gọvanọ na-achị Steeti Enugwu bụ Maazị Ifeanyi Ugwuanyị, tọrọ ntọala iwuwe Mahadum ebe a na-azụpụta ndịnkuzi nʻEnugwu. Mgbe ọ na-atọ ntọala a, Gọvanọ Ugwuanyị sịrị na iwu ụlọakwụkwọ ukwu a so na mbunuche ya mgbe ya weere ọchịchị na steeti ahụ. O kwuru na o nweghị ihe dị ka mmụta, ma kwukwaa na ịzụpụta ndịnkuzi dị […]

Bịa Fara na Bịafra (2)

Posted 1 CommentPosted in Akụkọ Ụwa

M.O. ENE Agba Abụọ Onye sị Ndiigbo akọzịna maka Bịafra, ya soro ọkụkọ laba ụra. A ga na-echete Bịafra ma Ọnwaise gbaa mkpụrụ ụbọchị iri-atọ. Bịafara ga-adị rue mgbe ebighiebi, ihe ọ sọkwara mmadụ na mmụọ mewe! Ihe anyi ga na-ekwuzi ụbọchị nchete ndị ọzọ bụ ihe Bịafra mere anyị na ihe anyi ji ya mere. Taata, anyị ga-ebuli aha à n’elu kacha elu; ya kpọtụwa!    Ndị na-ekwu na […]

Bịa Fara na Bịafra

Posted 2 CommentsPosted in Akụkọ Ụwa

M.O. ENE     Agba Mbụ Ụfọdụ ndịmmadụ na-asị ka anyị chefuo maka Bịafra? Ka mụ jụkwaa nu-o: “Onye chefuru ebe mmiri bidoro mawa ya, ọ ga-echetekwe ebe ọ kwụsịrị ịma ya?” Mbanụ! Biafra bụ ngọzị pụrụiche na ndụ Ndiigbo nakwa nke Naịjịrịa—ma anyị chezie echiche ọfụma. Nsogbu bụ na ndị chịrị Naịjịrịa kemgbe 1970 rue taata aghọtaghị na onye vu ihe ishi ka ijiji na-eso. Ya ka ha jiri […]

Amerika Emeriele Naịjirịa nʻEgwuregwu Bọọlụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Nnụnụ isi akaghị aka anaghị eje akwa ọtụrụkpọọkpọ. Nke a bụ ihe ndị egwuregwu bọọlụ nke a kpọrọ Flying Eagles nke Naịjirịa chọpụtara mgbe ha na ogbo ha ndị Amerika zutere nʻegwuregwu bọọlụ mba ụwa nke a na-agba na Poland. ỤmụAmerika jiri ọkpụ abụọ a na-asaghị asa were merie Naịjirịa. Mgbe egwuregwu malitere, ndị Flying Eagles nwere olileanya na ha ga-emeri, ebe ha jirile ọkpụ anọ were merie ndị ogbo […]

Akajiakụ Femi Odetola Agaala Leta Christian Chukwu na Lọndọnụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Akajiakụ ji ego achụ ego, Omepụrụonyeọdịịrị, Maazị Femi Odetola, onye nke nyere puku dọla iri ise ($50,000) maka ọgwụgwọ ọrịa Maazị Christian Chukwu, agaala Lọndọnụ ije leta ya bụ onye ọrịa. Maazị Odetola mere mjem nleta a na ntụmadị iji hụ etu Maazị si agbake. Mgbe o ruru nʻụlọọgwụ ebe Maazị Chukwu nọ na Lọndọnụ, o jiri ohere ahụ were kwuoro ndị dịbịa Bekee dị iche iche bụ ndị na-agwọ […]

Ndị APGA Ebole Gọvanọ Obianọ Ebubo

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Otu kpọrọ onwe ha APGA Peopleʻs Alliance ebole gọvanọ na-achị Steeti Anambara bụ Maazị Willie Obianọ ebubo na ọ chọrọ ime ha “i were nke a i rie m ego” nʻihe gbasara ịhọpụta onyeisioche otu ndọrọndọrọ APGA. Ndị otu a were maara ya bụ gọvanọ ọkwa ka ọ gharakwa ịkpa nwa agụ aka nʻọdụ maka na ọ nwaa nke a anwaa, ya ezị ya ihe ọkụ na-eme ntị oke. Nʻozi […]

Saraki Etoole Ụmụnwaanyị Egwu Bọọlụ Super Falcons

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Ụbọchị Satọdee gara aga ka ụmụnwaanyị egwuregwu bọọlụ Naịjirịa a kpọrọ Super Falcons jiri ọkpụ isii a sara ise were merie ndị ogbo ha ndị Cote d’Ivoire were buru iko West African Footbool Union (WAFU). Onyeisi ụlọ ukwu na-emebe iwu na Naịjirịa toro ụmụagbọghọ a maka ike ha kpara nʻasọmmpi egwuregwu ahụ. Nʻozi o sị nʻọnụ onye ndụmọdụ ya na-ahụ maka mgbasaozi bụ Maazị Yusuph Olaniyonu were zisaa, Maazị Saraki […]