Gọvanọ Umahi nke Steeti Ebọnyị Ga-achụ Onye Ọbụla Kwutoro Buhari nʻỌrụ

Posted 2 CommentsPosted in Akụkọ Ụwa

Gọvanọ na-achị Steeti Ebọnyị bụ Maazị David Umahi adọọla aka na ntị na ya ga-achụ onye ọbụla kwutoro maọbụ kparịa onyeisi ala bụ Momahadu Buhari nʻọrụ. Maazị Umahi kwuru nke a nʻozi o siri nʻaka onye enyemaka ya pụrụ iche gbasara nzisa ozi, bụ Maazị Francis Nwaze wee zipu. Ozi a gaara ndị niile na-arụrụ Steeti ahụ ọrụ.

Ọsọ Abaala Ndị Otu Okorocha nʻỤkwụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Anya achaala ndị Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ọbara ọbara ebe ndị otu Rochas Okorocha nọ. Ozi na-eru Ụwandịigbo aka na-akowa na ọ bụzị oke nʻọhia, ngwere nʻụzọ ebe EFCC na-achụghara ụfọdụ ndị rụọrọ Maazị Okorocha ọrụ mgbe ọ bụ onyeọchịchị Steeti Imo. Ụfọdụ nʻime ndị a emiele ala ebe ndị ọzọ hapụrụ Owere wara ọsọ.

Eze Nkporo Ekeleele Ndịigbo Bi na Mba Boston

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Eze ọdịnala nke na-achị mba Nkporo, nke dị na Steeti Abia bụ Eze Patrick Ogbuagu (Ezeaja nke Nkporo), etoole ndịigbo bi na mpaghara Amerika a na-akpọ New England nʻetu ha si akwalite asụsụ na omenala Igbo na mba ofesị. Ezeaja Ogbuagu toro otuto a mgbe ọ gara mmemme Ụbọchị Ndịigbo nke a mere na Boston ụbọchị onwa Ọgọọsịtị dị na mkpụrụ ụbọchị iri nke afọ 2019.

Mmemme Ụbọchị Ndịigbo nʻAmerika

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Ụbọchị Satọdee Ọnwa Ọgọsọsịtị dị nʻụbọchị iri na otu ka ndịigbo bi na mba mebere New England nke Amerika (Massachusetts, Rhode Island, Connecticut, Maine, New Hiampshire na Vermont) mere mmemme Ncheta Ụbọchị Ndịigbo (Igbo Day) nke afọ 2019. Mmemme a nke omenafọ na-akpọkọta ndịigbo niile, ma nwata ma okenye, iji gosipụta ma kwalite asụsụy, omenala na ọdịnala Igbo.