
ENUGWU – Ndị Uweojii nọ nʻEnugwu ekwuole na otu ụkọchukwu nke aha ya bụ Fada Arinze Madụ, nke ndị ntọrị nwụọrọ ka ụrịọm ọkụkọ, enwerele onwe ya. Onye gbara ama a bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nʻEnugwu bụ Maazi Ebere Amaraizu.
Maazị Madụ danyere nʻaka ndị ntọrị a nʻuhuruchi ụbọchị Mọnde mgbe ọnwa Ọktoba dị na mpụrụụbochị iri abụọ na asatọ. Ụkọchukwu a nọ nʻihu ebe a na-azụ ndị Fada mgbe ndị ntọrị a wakporo ya. Ụkọchụwu Madụ nweere onwe ya ụbọchị Wenezdee mgbe ọ nọrọla nʻaka ndị omekome a abalị abụọ.
Maazị Ebere Amaraizu kọwara na Ụkọchụkwu Madu enweghi ihe mere ya kama na ndị uweojii ka na-achọ ndị rụrụ ala ahụ.