Akụkọ Ụwa

Ọkụ Akpaala Ike n’Ọnịcha

Ọnịcha Ewurule Ọkụ

ỌNỊCHA – Ebelegbu gburu n’Upper Iweka nke Ọnịcha dị na Steeti Anambara ụbọchị Wenezdee ọnwa Ọkụtoba dị na mkpụrụụbọchị iri na isii mgbe ọkụ gbagburu mmadụ atọ tinyere otu nwaanyị na nwa o ku n’aka. Ọkụ ahụ jidekwawa akụnaụba ụmụmmadụ nke ruru ijeri kwuru ijere naịra taríe. 

 

Ndị hụrụ n’anya na-akọwa na ọkụ ahụ malitere mgbe ụgbọala bu mmanụ petrolu dara ma tiwuru ọkụ. Nke a mere ka Ọnịcha ghọọ oke nʻọsọ, ngwere nʻọsọ.  Mana ihe gbara ọtụtụ mmadụ gharịrị ka ahụrụ a nyụrụ nʻelu nkwụ siri gbaa ijiji gharịị bụ na ndị ụlọọrụ nke ọrụ ha bụ ịgbanyọ ọkụ enweghị ihe ha nwere ike ime gbasara ọkụ ahụ, nʻagbanyeghị na ọtụtụ mmadị weere ekwentị kpọọ ha ka ha bịa gbanyụọ okụ. Ha bụ okenye nọ nʻụlọ ewu were mụọ nʻọgbịrị.

 

Mgbe ọkụ gbachara, ɡọvanọ na-achị Steeti Anambara bụ Willie Obianọ mere ngwangwa hiwe ọgbakọ kọmiti nchọpụtaka ka ha sie imi nʻala chọpụta ebe mmiri siri banye opi ụgbọgụrụ. Mana ọtụtụ mmadụ a gbara ajụjụ ọnụ sịrị na nke nyiri imekwasị ozu ọgwụ maka na isi akwụ dara nʻala emetula aja. Ajụrụ ụmụmmadụ na-ajụ bụzị: gịnị mere na ndị ụlọọrụ na-alụso ọkụ ọgụ enweghị ihe ha mere gbasara ọkụ ahụ?

Leave a Reply