EFCC Anwụchiela Ndị ‘Yahoo Yahoo’ Iri na Anọ n’Anambra

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

si nʻaka Izunna Okafor nʻAwka Onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ. Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ anwụchiela mmadụ iri na anọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro site n’usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụụ ịntaneetị a maara dịka […]

Ndị Nimo Eriele Ji Ọhụrụ, Kpọọ Òkù Nkwalite Asụsụ Na Omenala Igbo

Posted Leave a commentPosted in Mmemme

Si n’aka Izunna Okafor, Awka, Nigeria Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Nimo, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra merùbèrè otu oke mmemme e jiri mara ndị Igbo, bụ mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020. Ya bụ mmemme a kpọrọ Ịwa Ji Nimo bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra, ma bụrụkwa […]

Mmemme Iri Ji Ọhụụ Dịka Omenala Igbo

Posted Leave a commentPosted in Mmemme

Si n’aka Izunna Okafor, Awka, Nigeria Iri ji ọhụụ abụghịzị okwu ọhụụ na ntị nwa ọbụla gbara ahọ n’ala Igbo. Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị na-enye ya nkwọwa dị iche-iche ma na-ahụtakwa ya dịka nke ma ọ bụ nke ọzọ. Kaosiladị, Igbo sị na-abụ e gburìsie anụ enyi, o kwere obubu, maka na ọ bụrụ na ọkpụ aja akọwaghị ihe ọ kpụrụ, òfèkè nwere ike ịkpọ nwansu amụ dike. […]

Ịgba Afa

Posted Leave a commentPosted in Mmemme

Si n’aka: Izunna Okafor     Ndị Igbo nwere ọtụtụ nkwenye dị iche iche, bụ ihe ha jidesiri aka ike, ma bụrụkwa nke sitere n’aka ndị nna nna anyị wee rute anya aka. Nkwenye ndị a abụghị naanị na ha sitere n’aka nna nna anyị ha wee rute anyị aka, kama, ha na-apụtakwa ìhè ma na-emezùpụtakwa emezupụta dịka a tụrụ anya. Ndị Igbo, ọkachasị na mgbe gboo, nwere otu usoro […]

Ndị Abacha Ekwupụtala Obi Ha Banyere Igwe Ha A Chụrụ Achụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Si n’aka: Izunna Okafor, Awka, Nigeria   Ndị obodo Abacha dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee mee ịkpọ ganị-ganị n’ụzọ udo, banyere ọchụchụ ahụ gọọmenti steeti ahụ chụrụ eze ọdịnala ha bụ Igwe Godwin Ben Chuba Mbakwe.Ịkpọ ganị-ganị ahụ bụ nke ndị ahụ malitere na mpaghara ebe dị iche iche n’obodo ahụ, ma bụrụkwa nke ha meere wee gaa n’obi gọọmenti steeti ahụ […]

Anambra Agbaala Afọ Iri Abụọ Na Iteghete

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Si n’aka: Izunna Okafor, Awka, Nigeria   Igbo sị na ọha mmụọ na ọha mmadụ na-ama ụbọchị a mụrụ dike, ma sịkwa na ọ na-abụ oke ọkụkọ kwaa akwa, ndị mbụ na ndị ègèdè anụ olu ya.Ka ọ dị taa, steeti Anambra àgbàala  afọ iri abụọ na iteghete e jiri kèé ya. Dịka ya bụ steeti na-emerùbe ncheta ụbọchị e kepụtara ya, ọ dị mkpa ịrụtụ aka n’akụkọ ntọala steeti […]