Akụkọ Ụwa

Robert Mugabe Alaala Ala Ahụdebe

Robert Mugabe

ZIMBABWE – Onye ọchịchị lara ezumikenka na mba Zimbabwe bụ Maazị Robert Mugabe alaala ala ahụdebe. Maazị Mụgabe nwụrụ nʻulọọgwụ di na Singapore ụbọchị ọnwa Seputemba dị na mkpụrụ ụbọchị isii. 

 

Maazị Mugabe malitere dịka onye nkuzi na Zimbabwe, ma mechaa bụrụ onye agha nzuzo nyere aka were kwatuo ma kpochapụ ọchịchị nchịgbu isiabaokpu na mba ahụ. Mgbe ndị mba ahụ nweere onwe ha, Maazị Mugabe ghọrọ onye isi Zimbabwe. Ọ chịrị mba Zimbabwe ihe karịrị afọ iri atọ tupu a chụpụ ya nʻọkwa afọ abụọ gara aga. Ọ gbara afọ iri iteghete na ise tupu ọ lakwuru onye kere ya.

 

Onyeisi Zimbabwe ugbu a bụ Maazị Emmerson Mnangagwa, onye bụbu osote Mugabe tupu ọ chụpụ nna ya ukwu Mugabe nʻọkwa, mere ka ụwa mata maka ọnwụ Maazị Mugabe. Ọ sịrị na agụgụala mba Zimbabwe agaghị ezu oke ma a gụnyeghị Maazị Mugabe. O kwuru na mba Zimbabwe nọ nʻiru uju nʻihi ọnwụ nna ha bụ Robert Mugabe.

Leave a Reply