Akụkọ Ụwa

Eze Nkporo Ekeleele Ndịigbo Bi na Mba Boston

Ezeaja. Patrick Ogbuagu Ishiturugo Ugochukwu Iroeche

BOSTON – Eze ọdịnala nke na-achị mba Nkporo, nke dị na Steeti Abia bụ Eze Patrick Ogbuagu (Ezeaja nke Nkporo), etoole ndịigbo bi na mpaghara Amerika a na-akpọ New England nʻetu ha si akwalite asụsụ na omenala Igbo na mba ofesị. Ezeaja Ogbuagu toro otuto a mgbe ọ gara mmemme Ụbọchị Ndịigbo nke a mere na Boston ụbọchị onwa Ọgọọsịtị dị na mkpụrụ ụbọchị iri nke afọ 2019. 

 

Omenka Ejike Eze Mgbe Ọ na-Anabata Ezeaja Nkporo

Nʻokwu ya, Ezeaja Ogbuagu sịri na ihe mere ụbọchị ahụ bụ ihe ebube na ịtụnanya. O wee kelee Chineke onye mere ka ya dị ndụ were anya ya hụ ebe ndịigbo jiri omenala ha kpọrọ ihe. Eze Ogbuagju sịrị na egwu mba dị iche iche buputere ụbọchị ahụ tụrụ ya nʻanya, mana ihe kacha tụ ya nʻanya bụ ihụ na ndịigbo bi na New England nwere ụlọakwụkwọ ebe a na-akuzi asụsụ na omenala Igbo. O kelere ụmụaka Igbo Language School of New England, onyeisi ha bụ Maazị Obiajulu Aduba na ndị nkuzi ha etu ha siri were asụsụ Igbo mee ihe ngosipụta ụbọchị ahụ.

 

Ezeaja na Igwe Okwesili

Ezeaja sịrị ha ọ magburu onwe ya etu ndịigbo niile siri pụta ụbọchị ahụ, gosi na ha bụ Igbo. O kelere ndị na-achị ndịigbo na New England, tụmadị Onyeisi Ndiigbo bụ Ọkaa Ejike Eze (Omenka nʻUdi) na onyeisi mmemme bụ Ọzọ Chuba Chibueze (Ọzọ Akụolisa na Nise) etu ha siri chịkọba ya bụ mmemme, nakwa maka oku ha kpọrọ ya isonye na mmemme ahụ. Ndị ọzọ Ezeaja toro bụ Maazị Patrick Idima onye nyere aka maka ọbịbia Ezeaja nakwa Maazị Odim Obasi Odim (Omeroha na Nkporo) onye nọ ọnọdụ ka nna ndị Nkporo na New England. 

 

Ndị Nkporo gbara ndị nke abụọ nʻasọmmpi e mere ụbọchị ahụ. Ndị eze ọzọ bịara mmemme ahụ tinyere Igwe Peter Okwesili (Mmilinaezoroha nke Egede) na Onyeeze Ugochukwu Iroeche (Ishituruugo nke Awa Ukwu, Umuawa Alaọcha).

Leave a Reply