Akụkọ Ụwa

Ọgbakọ Ndịigbo na New England Etoole Ndịnkuzi na Ụmụakwụkwọ Igbo

Muna Eze na Chuba Chibueze

Ụbọchị Ụka Disemba 1, 2019, ọgbakọ ndịigbo na mpaghara Amerika a na-akpọ New England mere mmemme ha jiri jaa ndịnkuzi na ụmụakwụkwọ niile nọ nʻụlọakwukwo Igbo ha ike. Na mmemme ahụ, ụmụakwụkwọ niile nwetere ihe onyinye iji gbaa ha ume ka ha na-amụtawanye asụsụ Igbo. Ndị kara mee nke ọma nʻule mmechi afọ ụlọakwụkwọ Igbo ahụ nwetekwere ihe onyinye pụrụ iche maka ugo ha tutere na ya bụ ule. O beghị na nke a. Ọgbakọ ahụ nyekwere ndịnkuzi niile ihe onyinye maka mbọ ha na-agba ime ka asụsụ na omenala Igbo na-aga nʻihu site nʻikuziri ụmụaka Igbo na-anaghị ego ọbụla.

Mgbe ọ na-ekwu okwu, onyeisioche ndịigbo na New England, bụ Ọzọ Chuba Chibueze, sịrị na ya na ndị otu ya wepụtara ụbọchị ahụ iji kwanyere ndị ụlọakwụkwọ Igbo ugwu maka na asụsụ Igbo dị oke mkpa maka ọganihu Igbo. O kelere onyeisi ndịigbo lara ezumike bụ Omenka Ejike Eze na mbọ niile ọ na-agba ịkwalite asụsụ na omenala Igbo. O kelekwere onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Maazị Obiajụlụ Adụba na ndịnkuzi ya niile etu o siri eme ka ụlọakwụkwọ ahụ na-aga nʻihu.

Nʻokwu nke ya, otu nwoke e jiri ihe gbasara asụsụ Igbo mara na mpaghara New England, bụ Maazị Emeka Ihionu, siri na ọ magburu onwe ya etu e siri aja ndịnkuzi na ụmụakwụkwọ Igbo ike maka na e too onye gwọtara akịdị, ọ gwọta ụgba. O were gaa nʻihu buru ụkpa ekele bugara Omenka Ejike Eze onye hiwere ụlọakwụkwọ Igbo ahụ ihe kariri afọ isii gara aga mgbe ọ bụ onyeisi ndịigbo na New England.

 

Ọtụtụ ndị ọzọ kwuru okwu ụbọchị ahụ tinyere Mz. Chidi Oguekwe, Mz. Obiajulu Adụba, Omenka Ejike Eze, Odz. Chinwe Okoye, Odz. Helen Nebo na Mz. George Okoye. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ndị natara ihe onyinye sịrị na obi dị ha mma, tụmadị etu ihe onyinye ahụ siri bịa tupu Ekeresimesi eruo.

Leave a Reply