Edemede

O Nweghi Onye Isi Zuru Ezu Ga-Atụnyere Buhari Vootu – Ọhaneze

Ọhaneze Ndịigbo bụ otu jikọtara ndịigbo niile nʻụwa, ekpebiele na o nweghi onye isi zuru oke ga-atunyere onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari vootu nʻafọ 2019. Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, onye mgbasaozi Ohaneze bụ Maazị Uche Achi-Okpaga kwuru na a naghị eti nwata ihe sị ya ebena akwa. Ọ kọwara na ihe ndị ogbuaraọbara kpọrọ onwe ha ndị na-achị ehi na-eme ụmụmmadụ akarịala. O wee sị na ebe onyeisiala kwadoro ndị omekaome a, na o nweghi onye isi zuru ezu ga-atụnyere ya vootu maka na mmadụ anaghị ahụcha isi nʻanya gaa kpuo ya.

Leave a Reply