Akụkọ Ụwa

Ndị Fụlani Na-achị Ehi Aghọọlara Mmadụ O So Chi Egbu

Ndị Naijiria na-anọzụ nʻụlọ ha nọpịa ihe ha jiri bụrụ nwoke. Ndi Fulani na-achị ehi aghọolara ụmụmmmadụ o so chi egbu. A na-ekwu nke ha mere, ha ana-eme ọzo. Ugbu a, ha awakpola ndị obodo Ọkpankụ, dị n’okpuru ọchịchị Anịnri nke steeti Enugu ọzọ, ma were mma gbukasịa otu onye nche.

Ya bụ mkpamkpa bụ nke were ọnọdụ ụbọchị Monde gara aga ma bụrụkwa nke wetara ọtụtụ mmerụ nyere nwa amadi ahụ, dịka ha weere mma bọọ ya ka anụ ehi.

Dịka onye ọnọ mgbe o mere siri wee kọọ, ndị Fụlani ahụ chịịrị ehi ha na-aga iro ogologo n’obodo ahụ, wee ruo mgbe ha wụbàtara n’otu ezinaụlọ otu ọkaiwu Eric Ogbudu, wee malite ịghọ mkpụrụ osisi dị ebe ahụ, ka a ga-asị na ọ bụ nke nna ha kụrụ. Nke a mezịrị onye ọrụ nche nọ n’ụlọ ahụ jiri pụta wee chọọ ka o gbochie ha; ha wee nwụso ya ọgụ, ma were mma gburikọọ ya.

Ka nwa amadi ahụ malitezịrị iti mkpu ka a gbatara ya ọsọ enyemaka, ndị Fụlani ahụ bihapụrụ ya, rie mbọmbọ, ma tinye isi n’ọhịa, zofuo, dịka ha maara na ndị mmadụ ga-agbara bịaba ebe ahụ iji mara ihe na-eme.

Otu ọ dị ugbu a, ya bụ nwa amadi a wakporo ụlọ ya, bụ ọkaiwu Eric Ogbudu agaala nye mkpesa n’isi ụlọ ndị uwe ojii dị n’Ọkpankụ, ebe ụfọdụ ndị ụwe bụzịkwa ndị e zigaworo n’obodo ahụ ka ha ga mee ka iwe ndị ntorobịa bi n’obodo ahụ kutuo, bụkwa ndị kpebigoro na ha ga-achọpụtarịrị ebe ndị arụrụ ala ahụ nọ, ma gwọọ ha ji mmanụ.

N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Ebere Amaraizu kọwara na mwakpo ahụ bụ eziokwu, ma sịkwa na ndị ọrụ ja amalitego ime nnyocha banyere ya bụ ajọ ọnọdụ.

Leave a Reply