Akụkọ Ụwa

A Mala Maazị Bill Cosby Ikpe

Ụloikpe dị na mba Amerika amala Maazị Bill Cosby ike na ọ kpasoro ụmụnwaanyị agwa adịghị mma. Ihe karịrị ụmụnwaanyị atọ kwuru na Cosby tinyeere ha ihe na mmanya nke mere ha ha amakwaghị onwe ha. Ha kwuru na nke a mere ka Maazị Cosby werezie ha mere ihe masịrị ya.

Mgbe a gụpụtara ọmụmaikpa, nke a were Maazị Cosby iwe nke mere ka ọ taa mba ma kpọọ onye ọkaiwu nke gomeenti ajọ aha. Ọ bụrụ na a kpachaghị anya, Maazị Cosby, onye nke gbara iri afọ asatọ, ga-anọ nʻụlọmkọrọ ruo mgbe chi ya kpọrọ ya.

Leave a Reply