Akụkọ Ụwa

Ogbunigwe Agbawaala nʻỤlọ Onyeisioche Ọhaneze Ndịigbo

Chief Nnia Nwodo
Chief Nnia Nwodo

Ndị omekome atụọla ogbunigwe nʻụlọ onyeisioche Ọhaneze Ndịigbo bụ Maazị Nnia Nwodo. Nke a mere nʻụtụtụ ụbọchị Ụka mgbe ọnwa Apureelu dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na iteghete. Ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii nʻEnugwu bụ Maazị Ebere Amaraizu siri na ọ bụ nʻụfọ ka ndị ekperime a siri tụnye ya bụ ogbunigwe.

Ndị hụrụ nʻanya na-akọwa na ya bụ ogbunigwe gbariri akụkụ ụlọ ahụ mana o merughi mmadụ ahụ. Mana ruo ugbu a, o nwebeghi onye ndị uweojii jidere maọbụ kpụpụ ụlọike na ọ bụ ya tụrụ ogbunigwe ahụ.

Leave a Reply