Ahụike

Mmekọrịta nʻEtiti Ọbaramgbalielu, Ọrịa Shuga na Isi

Dịka anyị maara, ọbaramgbalielu na ọrịa shuga bụ ọrịa ndị na-eso ebute ikpu ishi. Ọtụtụ ọrịa anya nke nwere ike ibute ikpu ishi nke ọbaramgbalielu na-ebute bụ:

(1) Arteriolo-Sclerotic Retinopathy.

Nkea bụ nsogbu ala anya (retina) nke ọbaramgbalielu na-adịghị ala ala (chronic) na arteriolo-sclerosis na-ebute.

(2) Hypertensive Retinopathy.

Nke a bụ nsogbu ala anya (retina) nke oke ọbaramgbalielu nnukwu (acute) na-ebute.

Anaghị enwe apịajighị apịaji (spasms) nke akwara anya (nke a na-akpọ vasoconstriction) na ọtụtụ exudeshion na oruru ọbara nke ala anya.

Ihe na-ebutekarị nke a bụ ọbara mgbali elu ịza aza, tọxemịa nke afọ ime na ọbara mgbali elu gbasara akụrụ.

(3) Ishi anya oghee (glaucoma)

Ọbaramgbalielu nwere ike ibute anya mgbali elu nke nwere ike imebi akwara anya ma bute ishi anya oghee.

 

Ishi ọrịa shuga n’ebute bụ:

Retinopathy nke ọrịa shuga (Diabetic Retinopathy)

Nkea bụ nsogbu anya ọrịa shuga na-ebute. Ihe karịrị pacentị iri asa (70%) ndị na-arịa ọrịa shuga na-enwe ya. Ndị na-arịa ọrịa shuga na-ekpu ishi pacentị iri abụọ (20%) karịa ndị na-enweghị ọrịa shuga.

Enwere ike ịgwọ ọrịa diabetic retinopathy tupu o kpuo mmadụ isi.

Diabetic retinopathy nwere ọtụtụ mmebi n’anya.

 

Site n’aka:

Dọkịnta Achụkọ Nnamdị

08035830985

Leave a Reply