Akụkọ Ụwa

Bianca Ojukwu Akpọọla Gọvanọ Obianọ Ọkụkọ Echetaghị Onye Foro Ya Ọdụ nʻUdummiri

Odoziakụ Bianca Ojukwu

Nwunye Dim Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, Ikemba Nnewi na Dikedịọramma ndịigbo, bụ Odoziakụ Bianca Ojukwu akpọọla Gọvanọ na-achị Steeti Anambara bụ Willie Obiano ọkụkọ amaghị onye foro ya ọdụ nʻudummiri. Nke a mere mgbe a na-eme mmemme e ji echeta dike ndịigbo lara mmụọ bụ Dim Odumegwu Ojukwu nke e mere na Mahadum Odumegwu Ojukwu dị nʻỊgbaarịam. Gọvanọ Obiano ejeghị mmemme ahụ.

Gọvanị Willie Obianọ

Mgbe ọ na-ekwu okwu, Odoziakụ Bianca Ojukwu gbarụrụ ihu wee kwuo na nke a bụ nke ugboro abụọ Maazị Obiano abịaghị ya bụ mmemme nke a na-eme kwa afọ. Odoziaku Ojukwu gwara Osote Gọvanọ bu Maazị Nkem Okeke, nke kwuru na ya na-anọchite anya Maazị Obiano, ka ọ gwa Maazị Obianọ na o chefuole na ọ bụ Dim Chukwuemeka Ojukwu mere ya ihe ọ bụ taa. Odoziakụ Ojukwu kwuru na ọ bụ ihe mwute na ya bụ Maazị Obiano enweghi ike wepụta ohere bịa soro ibe ya kwanyere onye e ji maka ya gbakọọ ebe ahụ ugwu ruoro ya.

 

Okwu a ebutele nnukwu ndọrọndọrọ na Steeti Anambara. Ụfọdụ mmadụ na-akwado ihe Odoziakụ Ojukwu kwuru ebe ndị ọzọ na-asị na etu o siri dowe ọnụ kwuo ya bụ okwu adịghị mma. 

Leave a Reply