Gọvanọ Umahi nke Steeti Ebọnyị Ga-achụ Onye Ọbụla Kwutoro Buhari nʻỌrụ

Posted 2 CommentsPosted in Akụkọ Ụwa

Gọvanọ na-achị Steeti Ebọnyị bụ Maazị David Umahi adọọla aka na ntị na ya ga-achụ onye ọbụla kwutoro maọbụ kparịa onyeisi ala bụ Momahadu Buhari nʻọrụ. Maazị Umahi kwuru nke a nʻozi o siri nʻaka onye enyemaka ya pụrụ iche gbasara nzisa ozi, bụ Maazị Francis Nwaze wee zipu. Ozi a gaara ndị niile na-arụrụ Steeti ahụ ọrụ.

Ọsọ Abaala Ndị Otu Okorocha nʻỤkwụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Anya achaala ndị Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ọbara ọbara ebe ndị otu Rochas Okorocha nọ. Ozi na-eru Ụwandịigbo aka na-akowa na ọ bụzị oke nʻọhia, ngwere nʻụzọ ebe EFCC na-achụghara ụfọdụ ndị rụọrọ Maazị Okorocha ọrụ mgbe ọ bụ onyeọchịchị Steeti Imo. Ụfọdụ nʻime ndị a emiele ala ebe ndị ọzọ hapụrụ Owere wara ọsọ.

Eze Nkporo Ekeleele Ndịigbo Bi na Mba Boston

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa

Eze ọdịnala nke na-achị mba Nkporo, nke dị na Steeti Abia bụ Eze Patrick Ogbuagu (Ezeaja nke Nkporo), etoole ndịigbo bi na mpaghara Amerika a na-akpọ New England nʻetu ha si akwalite asụsụ na omenala Igbo na mba ofesị. Ezeaja Ogbuagu toro otuto a mgbe ọ gara mmemme Ụbọchị Ndịigbo nke a mere na Boston ụbọchị onwa Ọgọọsịtị dị na mkpụrụ ụbọchị iri nke afọ 2019.