Akụkọ Ụwa

Ọsọ Abiola Esula nʻAPC

mohammed_buhari
Onyeisiala Mohammed Buhari

Ọgbaaghara adaala n’ụlọmmebeiwu nta nke Naịjiria nke a na-akpọ House of Representatives na Bekee. Ihe karịrị ndị omebeiwu iri atọ na asaa ahapụla All Progressive Congress (APC) ha nọbu na ya wee gbaga Peoples Democratic Party (PDP).

 

Onye mere ka a mata nke a bụ Okwupụtaokwu ụlọomebeiwu ahụ bụ Yakubu Dogara. Maazị Dogara kwuru nke a mgbe ọrụ malitere ụbọchị Tuuzdee. Maazị a mekwara ka a mara na ndịomebeiwu anọ ndị ọzọ hapụwara APC were banye African Democratic Congress (ADC).

 

Ndị mmadụ na-ajụzị ihe mere ndị nọ na APC, nke bụ otu onyeisi ala bụ Mohamed Buhari, ji agba ọsọ Abiola ka a ga-asị na ya bụ ụgbọ APC na-ekpu ekpu.

Leave a Reply