Akụkọ Ụwa

Ọsọ Abaala Ndị Otu Okorocha nʻỤkwụ

Rochas Okorocha

Anya achaala ndị Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ọbara ọbara ebe ndị otu Rochas Okorocha nọ. Ozi na-eru Ụwandịigbo aka na-akowa na ọ bụzị oke nʻọhia, ngwere nʻụzọ ebe EFCC na-achụghara ụfọdụ ndị rụọrọ Maazị Okorocha ọrụ mgbe ọ bụ onyeọchịchị Steeti Imo. Ụfọdụ nʻime ndị a emiele ala ebe ndị ọzọ hapụrụ Owere wara ọsọ.

Nʻokwu na nʻEnugwu, onyeisi ndị EFCC na mpaghara ndịda ọnwụwaanyanwụ bụ Maazị Usman Imam sịrị na otu ya elekwasịla anya nʻụlọ dị iche iche nke a na-eche na Maazị Okorocha, ndị ezinaụlọ ya na ụfọdụ ndị na-eso ya jiri ego e zutere nʻohi were zụọ. O were kwuo na a na-eme nyocha etu Maazị Okorocha na ndị otu ya siri weta ụlọ na akụ dị iche iche nʻafọ asatọ ha nọrọ nʻọchịchị. O kwu na a na-achọ ka ndị a bịa zaa ajụjụ ọnụ mana anya ahụghị ha.

 

Ọtụtụ ndị a gbara ajụjụọnụ nʻOwere sịrị na ọ bụ etu ahụ ka imi kwesiri ịdị onye kpọrọ ụtaba. Ndị mmadụ kpọrọ oku ka EFCC lebakwa anya ebe ndị omebeiwu Steeti Imo nọ maka na ọtụtụ nʻime ha naara Maazị Okorocha ngarị mgbe ọ na-agba mbọ itinye ọgọ ya nwoke bụ Maazị Uche Nwosu nʻọkwa.

Leave a Reply