Akụkọ Ụwa

Gọvanọ Umahi nke Steeti Ebọnyị Ga-achụ Onye Ọbụla Kwutoro Buhari nʻỌrụ

Gọvanọ Umahi na Mohamadu Buhari

Gọvanọ na-achị Steeti Ebọnyị bụ Maazị David Umahi adọọla aka na ntị na ya ga-achụ onye ọbụla kwutoro maọbụ kparịa onyeisi ala bụ Momahadu Buhari nʻọrụ. Maazị Umahi kwuru nke a nʻozi o siri nʻaka onye enyemaka ya pụrụ iche gbasara nzisa ozi, bụ Maazị Francis Nwaze wee zipu. Ozi a gaara ndị niile na-arụrụ Steeti ahụ ọrụ. 

 

Maazị Umahi akwụsịghị na nke a. O kwukwara na onye ọbụla e nyere ọkwa gomeenti ma ọ ghara ina-eto Maazị Buhari abụrụla onye a chụrụ achụ nʻọrụ. O wee sị na onye achọghị ina-eto Buhari maọbụ gọvanọ steeti ya ekwesighị ịnọ nʻọrụ steeti ahụ. Onye dị etu a kwesiri ịkwara ngwongwo ya gaa chọwa ihe ọzọ o ga-eme. O were kwuo na nke a bụ adọmaka na ntị nke ikpeazụ ya ga-enye gbasara nke a maka na ụkpana okpoko gburu, ọ bụ ntị chiri ya.

2 thoughts on “Gọvanọ Umahi nke Steeti Ebọnyị Ga-achụ Onye Ọbụla Kwutoro Buhari nʻỌrụ

  1. *EZIOKWU GA-EME KA I SI N’ORU PỤỌ* Jọn.8:32

    Akwụkwọ nsọ dị omimi. Ihe mbụ dị mkpa bụ ịgụ ya. Nke ọzọ bụ ịghọta ya, nke atọ were bụrụzịa itinye ya n’ọrụ maọbụ n’okwu n’ụzọ nakwa mgbe ziri ezi.

    Mgbe ana-ekwu maka onye maọbụ ndi ọchịchị, ọdị mkpa ịkwanyere ha ugwu mana nke ka mkpa bụ ịgwa ha eziokwu. Anyị ga-amatakwa na ikwu eziokwu ahụ adighị mfe. Mgbe ụfọdụ onwere ike iri isi onye kwuru ya, mana agaghị eji maka mgbagbu ghara ọgụ.

    Ọbụ n’ihi na Jọn nke mmiri Chukwu gwara onye ọchịchị Herọd eziokwu ka-eji bepu ya isi. Ọbụkwa n’ihi na Jizọs n’onwe ya gwara ndi ọchịchị oge ahụ eziokwu a ka ha jiri kpọgbue ya n’obe.

    Ịkatọ maọbụ ikwutọ ajọ ọchịchị dị ezigbo mkpa. Nke a egbochighị ịkwanyere ndi ọchịchị ugwu.

    Akwukwọ nke ilu mere ka anyị mata na mgbe ezigbo onye ọchịchị batara, na ọñụ na-adị. Mana mgbe ajọ onye ọchịchị batara na nnukwu ịsụ ude, ịta ikikere-eze na iru uju na-adị.

    Mgbe ọbụla mmadụ sụrụ ude, ịga-anụ ude onye ahụ.

    Ihe imerime ụmụ Naijiriya na-eme kịta bụ ịsụ ude. Ọbụghị ikwutọ onye ọchịchị.
    *kpọkwa ihe ọjọọ, ihe ọjọọ*.

    Onye ana-egbu egbu ga-ekwukwanụ ọnụ ya.

    Onye gbuwe achara onye gbuwe, onye akpọla ibe ya onye ikóyi.

    Ikwiikwii nyụrụ ahụ sị ụmụ ya kwere ya egwu; ụmụ ya gwara ya hoohaa! Na-anaghị ekwere ihe ọjọọ egwu.

    Ya gazie!
    Sai Nwenya

Leave a Reply