Akụkọ Ụwa

E Hiwele Otu Amotekun nʻỌdịdaanyanwụ Naịjirịa

Ndị gọvanọ na-achị steeti dịgasị n’ọdịdaanyanyụ Nigeria ehiwele otu nche a kpọrọ Akotekun. Ndị gọvanọ a na-akọwa na otu a ga-enyere ndị uweojii na ndọ ọrụ nchekwa obodo ndị ọzọ aka n’ịlụso ndị ogbuaraọbara Boko Haram agha. Gọvanọ ndị aka ha dị n’atụmatụ a bụ: Seyi Makinde nke Oyo, Kayode Fayemi nke Ekiti, Rotimi Akeredolu nke Ondo, Gboyega Oyetola nke Osun na Dapo Abiodun nke Ogun.

Mgbe ọ na-ekwu okwu na mmemme e jiri hiwe ya bụ otu Akotekun, Gọvanọ Fayemi sịrị na Amotekun abịaghị ịrụ ọrụ ndị uweojii kama na ọ bịara inyere ndị uweojii aka. Ọ sịrị na ọ bụrụ na Amotekun na ndị uweojii rụkọọ ọrụ ha nke ọma, mkpamkpa ndị Boko Haram nakwa otu ntọrị ndị ọzọ na-akpa ga-ebelata. Ọ sịrị na nke a ga-eme ka ndị mmadụ ñụọ mmiri tọgbọ iko karịa ịchị uche n’aka mgbe ọbụla.

 

Leave a Reply