Akụkọ Ụwa

ABUJA – Ụlọikpe Ukwu Naịjirịa Achụpụla Maazị Emeka Ihedioha nʻỌkwa

Emeka Ihedioha

Ihe na-eme na Steeti Imo dị ka ahụrụ a nyụrụ nʻelu nkwụ nke gbagwojuru ijiji anya. Akụkọ si steeti ahụ na-egosi na Ụlọikpe Ukwu Naịjirịa achụpụla Maazị Emeka Ihedịọha nke PDP dịka onye na-achị steeti ahụ. A na-akọwa na ụlọikpe a gara n’ihu kwuo na ọ bụzị Maazị Hope Ụzọdịmma nke APC ga-abụzị onyeọchịchị. Ụlọikpe okechaaobie a, nke onyeisi ya bụ Maazị Tanko Muhammad, kpebiri nke a nʻenweghị mgbagha nʻetiti ọkaiwu mmadụ asaa nọ na ya.

 

Hope Uzodimma

Ihe mgbagwojuanya gbasara ikpe abụghị naanị otu. Nʻụbọchị ọnwa Disemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri ato na otu ka otu ụkọchuchukwu nọ nʻEnugwu bụ Maazị Ejike Mbaka buru amụma wee gwa ndị na-eso ya na Maazị Hope Ụzọdịmma ga-achị Steeti Imo. Maazị Mbaka gara nʻihu kwuo na ya amaghị etu nke a ga-esi mee kama na ya maara na ọ bụ ihe Chineke gwara ya. Ọtụtụ mmadụ were na-ajụzị sị, ọ bụ Chukwu gwara Mbaka ka ọ bụ Buhari onye nke ya na Mbaka bụ ara na obi gwara ya? Otu onye a gbara ajụjụ ọnụ chetaara anyị na a nụta a kaara eze, ọ dị ka eze ọ gwọrọ agwọ. 

Leave a Reply