Akụkọ Ụwa

Amerika Emeriele Naịjirịa nʻEgwuregwu Bọọlụ

Sabastian Soto

Nnụnụ isi akaghị aka anaghị eje akwa ọtụrụkpọọkpọ. Nke a bụ ihe ndị egwuregwu bọọlụ nke a kpọrọ Flying Eagles nke Naịjirịa chọpụtara mgbe ha na ogbo ha ndị Amerika zutere nʻegwuregwu bọọlụ mba ụwa nke a na-agba na Poland. ỤmụAmerika jiri ọkpụ abụọ a na-asaghị asa were merie Naịjirịa.

Mgbe egwuregwu malitere, ndị Flying Eagles nwere olileanya na ha ga-emeri, ebe ha jirile ọkpụ anọ were merie ndị ogbo ha nke Qatar. Mana ihe ha amaghị bụ na ndị ha na-agbara afa bụ dibịa. Ka ọ na-ewete aka na nkeji iri na asaa egwuregwu jiri malite ka Sabastian Soto nke Amerika sụnyere ọkpụ nke mbụ. Mana ka a na-ekwu na oke tara ọka nwata, ọ shachanye ya ajịrịja nʻanya. Mgbe e ruru nʻagba nke abụọ, otu nwa ahụ bụ Sabastian Soto sụnyekwere ọkpụ nke abụọ iji gosi ndị Naịjirịa na onye na arọ onye karịrị ya anya bụ nkiri ka ọ na-ekiri ya.

 

Ụmụnaịjirịa gbaa mbọ ole ha nwere ike mana ihe ha enweghị ike ịsa goolu ndị ahụ.

Leave a Reply