Ndị Enugwu-Agụleri Emeela Olili Ọbịbịa Eri Nke Ahọ 2020

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Enugwu-Agụleri dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’ nke steeti Anambra merùbèrè mmemme Oriri Ọbịbịa Eri, bụ otu nnukwu mmemme ọdịnala pụrụ ichè e jiri mara obodo ahụ.Ya bụ mmemme bụ nke ndị obodo ahụ na-eme kwà ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke ha sitèrè na ya na-akwanyere nnukwu nna mụsàrà ha ùgwù, bụ Eri, ónyé bụ nwa mbụ […]

Obianọ Atọọla Ntọala Ụlọọgwụ Nlekọta Akụrụ Na Nnewi

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela ọrụ iguzòbe ụlọọgwụ ebe a ga na-elekọta akụrụ (kidney) mmadụ na Nnewi, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi North’ nke steeti ahụ.Ya bụ nnukwu ụlọọgwụ bụ nke a na-arụ site n’aka otu onye nnọrọonwe, bụ Dọkịta Okey Chidolue, ma bụrụkwa ebe a ga na-agwọ ma na-elekọta ụdị ọrịa akụrụ dị iche iche, ma ihe gbasaara inyòchà, ịgbanwògharị na itinyegharị akụrụ.N’okwu ya […]

Ọnọdụ Nchekwa: Gọọmenti Anambra Na Ndị Keke Enweela Ọgbakọ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọchịchị steeti Anambra nọrọ ụbọchị Wenezdee wee nwee ọgbakọ, ha na ndị na-anyà ụgbọala Keke Napep n’ime steeti ahụ.Ya bụ ọgbakọ bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tụlee ma tinye okwu ọnụ banyere ihe metụtara òtù ahụ, mpụ na arụrụala, nakwa ọnọdụ nchekwa steeti ahụ.N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, odeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu gbarụrụ ihu […]